33Eluigwe na ụwa ga-agabiga, ma okwu m enweghị ike ịgabiga.
34“Kpachapụkwanụ anya, unu ekwela ka e bogbuo obi unu site nʼoke oriri na ọṅụṅụ na nchekasị nke ndụ a, site otu a mee ka ụbọchị ahụ bịakwasị unu na mberede, dị ka ọnya.
35Nʼihi na ọ ga-abịakwasị ndị niile bi nʼelu ụwa.
36Nọrọnụ na nche oge niile ma na-ekpekwanụ ekpere ka unu nwee ike ịgbanarị ihe niile gaje ịbịa, ka unu nweekwa ike iguzo nʼihu Nwa nke Mmadụ.”
37Kwa ụbọchị, ọ na-ezi ihe nʼụlọnsọ ukwu ahụ, ma nʼuhuruchi, ọ na-arịgoro nʼelu Ugwu Oliv ị ga nọọ ọnọdụ abalị.