1Nʼoge a, Mmemme Achịcha na-ekoghị eko nke a na-akpọ Ngabiga na-eru nso.
2Ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu nọkwa na-achọ ụzọ ha ga-esi gbuo ya, nʼihi na ha na-atụ egwu ndị mmadụ.
3Mgbe ahụ, ekwensu banyere nʼime Judas, onye a na-akpọ Iskarịọt, otu nʼime mmadụ iri na abụọ na-eso ụzọ ya.