65Ha kwukwara ọtụtụ okwu ọjọọ na nke mkparị megide ya.
66Mgbe chi bọrọ, nzukọ ndị okenye na ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu zukọtara, a kpọtakwara Jisọs nʼihu ha.
67Ha na-ekwu, “Ọ bụrụ na ị bụ Kraịst, gwa anyị.” Ọ sịrị ha, “Ọ bụrụ na m agwa unu, unu agaghị ekwe.
68Ọ bụrụkwa na m ajụọ unu ajụjụ, unu agaghị aza m.
69Ma site ugbu a gawa, Nwa nke Mmadụ ga-anọdụ ala nʼaka nri nke ike Chineke.”