67Ha na-ekwu, “Ọ bụrụ na ị bụ Kraịst, gwa anyị.” Ọ sịrị ha, “Ọ bụrụ na m agwa unu, unu agaghị ekwe.
68Ọ bụrụkwa na m ajụọ unu ajụjụ, unu agaghị aza m.
69Ma site ugbu a gawa, Nwa nke Mmadụ ga-anọdụ ala nʼaka nri nke ike Chineke.”
70Ha niile sịrị, “Gị onwe gị, ị bụ Ọkpara Chineke?” Ọ sịrị ha, “Unu kwuru na Abụ m.”
71Mgbe ahụ ha sịrị, “Gịnị mere anyị ji na-achọ onye akaebe ọzọ? Anyị ejirila ntị anyị nụrụ ya site nʼọnụ ya.”