6O kwenyere, na-achọkwa ohere ga-adị mma ọ ga-eji nyefee ya nʼaka ha mgbe igwe mmadụ na-agaghị anọ.
7O ruo nʼụbọchị Mmemme Achịcha na-ekoghị eko ahụ bụ ụbọchị a na-eji atụrụ Ngabiga achụ aja.
8O zipụrụ Pita na Jọn sị, “Gaanụ kwadoo maka oriri Ngabiga nke anyị ga-eri.”
9Ha sịrị ya, “Ebee ka ị chọrọ ka anyị gaa kwadoo maka ya?”
10Ọ sịrị ha, “Lee, ka unu na-abata nʼobodo, otu nwoke bu ite mmiri ga-ezute unu, soronụ ya baa nʼụlọ ọbụla ọ banyere.