Luk 23

Ya mere Pailet kpebiri imere ha ihe ha chọrọ.

Luke 23:24 (UKJV) And Pilate gave sentence that it should be as they required.

22Ọ sịrị ha na nke ugboro atọ, “Ọ bụ nʼihi gịnị? Olee ihe ọjọọ nwoke a mere? O nweghị ihe ọbụla m chọpụtara nʼaka ya kwesiri iwetara ya ọnwụ. Ya mere aga m ata ya ahụhụ, hapụ ya.”

23Ma ha nọgidere na-eti mkpu nʼoke olu ka a kpọgide ya nʼobe, nʼikpeazụ olu iti mkpu ha karịrị.

24Ya mere Pailet kpebiri imere ha ihe ha chọrọ.

25Ọ hapụrụ nwoke ahụ ha chọrọ nke a tụbara nʼụlọ mkpọrọ nʼihi ọgbaaghara na igbu mmadụ, ma nyefee ha Jisọs nʼaka.

26Dị ka ha duu ya na-aga, ha jidere Saimọn onye Sirini bụ onye si nʼime otu obodo nta na-alọbata; ha boro ya obe ahụ, manye ya ka o buru ya na-eso Jisọs na-azụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.