Luk 23

Mgbe ha bịarutere nʼebe a na-akpọ Okpokoro Isi, ebe ahụ ka ha kpọgidere ya nʼobe ya na ndị ohi abụọ ahụ. Otu nʼaka nri ya nke ọzọ nʼaka ekpe ya.

Luke 23:33 (UKJV) And when they were come to the place, which is called Calvary, there they crucified him, and the malefactors, one on the right hand, and the other on the left.

31Ya mere, ọ bụrụ na ha mee ọhịa otu a mgbe ahịhịa dị ndụ dị na ya, gịnị ga-emekwanụ mgbe ọ kpọrọ nkụ?”

32Ha dukwaara mmadụ abụọ bụ ndị ohi gaa igbu ha na ya.

33Mgbe ha bịarutere nʼebe a na-akpọ Okpokoro Isi, ebe ahụ ka ha kpọgidere ya nʼobe ya na ndị ohi abụọ ahụ. Otu nʼaka nri ya nke ọzọ nʼaka ekpe ya.

34Jisọs sịrị, “Nna gbaghara ha nʼihi na ha amataghị ihe ha na-eme.” Ha ji ife nza kee uwe ya nʼetiti onwe ha.

35Ndị mmadụ guzoro ebe ahụ na-ele anya, ka ndị ọchịchị ji ya na-eme ihe ọchị, na-asị, “Ọ zọpụtara ndị ọzọ, ya zọpụtanụ onwe ya, ma ọ bụrụ na ọ bụ Kraịst nke Chineke, bụ Onye a họpụtara.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.