36Ndị agha bịakwara chịa ya ọchị. Ha nyere ya mmanya gbara ụka,
37ma na-asị, “Ọ bụrụ na ị bụ eze ndị Juu, zọpụtanụ onwe gị.”
38Ihe e dere nʼelu isi obe ahụ bụ: Onye a bụ Eze ndị Juu.
39Otu onye nʼime ndị ohi ahụ a kpọgidekwara nʼobe nʼebe ahụ kparịkwara ya sị, “Ọ bụghị gị bụ Kraịst? Zọpụtanụ onwe gị ma zọpụtakwa anyị.”
40Ma onye nke ọzọ a makwara ikpe ọnwụ baara ya mba sị, “Ị naghị atụ Chineke egwu, ị hụghị na a mara gị ikpe dị ka e si maa ya.