2Ha malitere ibo ya ebubo na-asị, “Anyị chọpụtara na nwoke a na-eduhie ndị obodo anyị niile, na-egbochikwa ha ịtụ ụtụ isi nye Siza, ma na-ekwukwa na ya bụ Kraịst, Eze.”
3Ya mere Pailet jụrụ ya sị, “Ị bụ eze ndị Juu?” Ọ zara ya sị, “Gị onwe gị kwuru otu a.”
4Mgbe ahụ Pailet gwara ndịisi nchụaja na igwe mmadụ ahụ, “O nweghị ihe ọjọọ ọbụla m chọpụtara nwoke a mere.”
5Ma ha gara nʼihu na-asị, “Ọ na-akpasu ọgbaaghara nʼala ndị Judịa niile site nʼozizi ya. Ọ malitere na Galili, ọ bịakwala ebe a ugbu a.”
6Mgbe Pailet nụrụ nke a, ọ jụrụ ma nwoke a ọ bụ onye Galili?