4Mgbe ahụ Pailet gwara ndịisi nchụaja na igwe mmadụ ahụ, “O nweghị ihe ọjọọ ọbụla m chọpụtara nwoke a mere.”
5Ma ha gara nʼihu na-asị, “Ọ na-akpasu ọgbaaghara nʼala ndị Judịa niile site nʼozizi ya. Ọ malitere na Galili, ọ bịakwala ebe a ugbu a.”
6Mgbe Pailet nụrụ nke a, ọ jụrụ ma nwoke a ọ bụ onye Galili?
7Mgbe ọ matara na o si nʼebe Herọd na-achị, o nyere iwu ka e dugara ya Herọd, onye nọkwa na Jerusalem mgbe ahụ.
8Obi tọrọ Herọd ụtọ nke ukwuu, mgbe ọ hụrụ Jisọs nʼihi na ọ nọ na-achọ ịhụ ya anya nʼoge dị anya gara aga. Sitekwa nʼakụkọ ọ nụrụ banyere ya, o lere anya na ọ ga-arụ ọrụ ebube ụfọdụ.