6Mgbe Pailet nụrụ nke a, ọ jụrụ ma nwoke a ọ bụ onye Galili?
7Mgbe ọ matara na o si nʼebe Herọd na-achị, o nyere iwu ka e dugara ya Herọd, onye nọkwa na Jerusalem mgbe ahụ.
8Obi tọrọ Herọd ụtọ nke ukwuu, mgbe ọ hụrụ Jisọs nʼihi na ọ nọ na-achọ ịhụ ya anya nʼoge dị anya gara aga. Sitekwa nʼakụkọ ọ nụrụ banyere ya, o lere anya na ọ ga-arụ ọrụ ebube ụfọdụ.
9Ya mere ọ jụrụ ya ọtụtụ ajụjụ, ma ọ zaghị ya ihe ọbụla.
10Ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu guzo nʼebe ahụ gara nʼihu bosie ya ebubo ike.