48Mgbe igwe mmadụ niile gbakọtara ilere anya hụrụ ihe mere, ha laghachiri nʼụlọ ha na-eti aka nʼobi.
49Ma ndị niile maara onye ọ bụ, tinyekwara ụmụ nwanyị ndị soro ya si Galili bịa, guzokwara nʼebe dị anya na-ele ihe ndị a.
50O nwere otu nwoke aha ya bụ Josef, onye so nʼotu ndịisi ụlọ nzukọ. Ọ bụ ezigbo mmadụ na onye aka ya kwụ ọtọ.
51Ọ kwadoghị mkpebi ha na omume ha. Onye sitere Arimatia, nʼotu obodo ndị Juu, onye na-echere ọbịbịa nke alaeze Chineke.
52Nwoke a gakwuru Pailet rịọọ ka e bunye ya ahụ Jisọs.