12Ma otu ọ dị, Pita gbaara ọsọ ruo nʼili ahụ, hulata ala hụ ka akwa ozu ndị ahụ tọgbọọrọ onwe ha; ọ lara na-atụgharị uche nʼime onwe ya ihe ihe ndị a pụtara.
13Nʼotu ụbọchị ahụ, mmadụ abụọ nʼime ha gaje nʼobodo nta a na-akpọ Emaus, nke dị ihe ruru kilomita iri na abụọ site na Jerusalem.
14Ha na-ekwurịta nʼetiti onwe ha banyere ihe niile mere.
15Dị ka ha na-ekwu na-akparịta ụka banyere ihe ndị a, Jisọs nʼonwe ya bịara soro ha na-aga ije.
16Ma e mechiri anya ha ịmata na ọ bụ ya.