35Mgbe ahụ, ha kọọrọ ha ihe mere nʼụzọ, ya na otu ha siri mata ya mgbe ọ nyawara achịcha.
36Mgbe ha ka na-ekwu banyere nke a, ya onwe ya guzooro nʼetiti ha sị ha, “Udo dịrị unu.”
37Oke egwu tụrụ ha, obi lọkwara ha mmiri nʼihi na ha chere na ha ahụla mmụọ.
38Ma ọ sịrị ha, “Gịnị mere ụjọ ji atụ unu, gịnị mere unu ji nwee obi abụọ?
39Leenụ m anya nʼaka na nʼụkwụ. Ọ bụ mụ onwe m! Metụnụ m aka ka unu hụrụ, nʼihi na mmụọ adịghị enwe anụ ahụ na ọkpụkpụ dị ka unu hụrụ m nwere.”