46Ọ sịrị ha, “Nke a bụ ihe e dere na, Kraịst ahụ ga-ahụ ahụhụ ma sitekwa nʼọnwụ bilie nʼụbọchị nke atọ.
47Na a ga-ekwusa nchegharị na mgbaghara mmehie site nʼaha ya nye mba niile, malite na Jerusalem.
48Unu bụ ndị akaebe nke ihe ndị a.
49Ma lee, agaje m izitere unu ihe ahụ Nna m kwere na nkwa. Ya mere, nọrọnụ nʼime obodo ruo mgbe a ga-eyikwasị unu ike nke si nʼelu.”
50O duuru ha garuo na Betani, chilie aka ya abụọ elu gọzie ha.