4Dị ka ha nọ na mgbagwoju anya banyere nke a, nʼotu ntabi anya, ha hụrụ mmadụ abụọ yi uwe na-egbu ka amụma guzo ha nso.
5Ha kpudoro ihu ha nʼala nʼihi oke egwu, ma mmadụ abụọ ahụ gwara ha, “Gịnị mere unu ji na-achọ onye dị ndụ nʼetiti ndị nwụrụ anwụ?
6Ọ nọkwaghị nʼebe a, o biliela nʼọnwụ, chetakwanụ ihe ọ gwara unu mgbe unu na ya nọ na Galili sị,
7‘A ghaghị inyefe Nwa nke Mmadụ nʼaka ndị mmehie, a ga-akpọgidekwa ya nʼobe ma nʼụbọchị nke atọ ọ ga-esi nʼọnwụ bilie.’ ”
8Mgbe ahụ ha chetara okwu ya.