Luk 24

Mgbe ahụ ha chetara okwu ya.

Luke 24:8 (UKJV) And they remembered his words,

6Ọ nọkwaghị nʼebe a, o biliela nʼọnwụ, chetakwanụ ihe ọ gwara unu mgbe unu na ya nọ na Galili sị,

7‘A ghaghị inyefe Nwa nke Mmadụ nʼaka ndị mmehie, a ga-akpọgidekwa ya nʼobe ma nʼụbọchị nke atọ ọ ga-esi nʼọnwụ bilie.’ ”

8Mgbe ahụ ha chetara okwu ya.

9Mgbe ha sitere nʼili ahụ lọghachi, ha kọọrọ mmadụ iri na otu ahụ na ndị ọzọ niile ihe ndị a.

10Ọ bụ Meri Magdalin, na Joana, na Meri nne Jemis na ụmụ nwanyị ndị ọzọ so ha kọọrọ ndị na-eso ụzọ ya ihe a.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.