14Saimọn (onye ọ kpọrọ Pita) na Andru nwanne ya, Jemis Jọn, Filip Batalomi.
15Matiu Tọmọs, Jemis nwa Alfiọs, Saimọn onye a na-akpọ Zilọt.
16Judas nwa Jemis na Judas Iskarịọt onye raara ya nye.
17Ya na ha rịdatara ga nʼebe ala dị larịị. Igwe ndị na-eso ụzọ ya na oke igwe mmadụ sitere na Judịa, na Jerusalem nakwa obodo dị na nsọtụ mmiri nke Taịa na Saịdọn.
18Ndị bịara ịnụrụ okwu ya na ka a gwọọ ha ọrịa ha. A gwọkwara ọtụtụ ndị mmụọ na-adịghị ọcha na-esogbu.