24“Ma ahụhụ na-adịrị unu ndị ọgaranya, nʼihi na unu eketala nkasiobi unu.
25Ahụhụ na-adịrị ndị afọ juru ugbu a, nʼihi na agụ ga-agụkwa unu. Ahụhụ na-adịrị ndị na-achị ọchị ugbu a, nʼihi na unu ga-eru ụjụ, bee akwa.
26Ahụhụ na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ niile na-ekwu okwu ọma gbasara unu, nʼihi na otu a ka ndị bụ nna ha mesoro ndị amụma ụgha.”
27“Ma a na m agwa unu ndị na-ege m ntị: hụnụ ndị iro unu nʼanya, mekwaaranụ ndị kpọrọ unu asị ihe ọma.
28Gọzienụ ndị na-abụ unu ọnụ, ma kpekwaaranụ ndị na-akparị unu ekpere.