26Ahụhụ na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ niile na-ekwu okwu ọma gbasara unu, nʼihi na otu a ka ndị bụ nna ha mesoro ndị amụma ụgha.”
27“Ma a na m agwa unu ndị na-ege m ntị: hụnụ ndị iro unu nʼanya, mekwaaranụ ndị kpọrọ unu asị ihe ọma.
28Gọzienụ ndị na-abụ unu ọnụ, ma kpekwaaranụ ndị na-akparị unu ekpere.
29Ọ bụrụ na onye ọbụla a maa gị ụra nʼotu ntị, tụgharịara ya ntị gị nke ọzọ. Ọ bụrụkwa na onye ọbụla anara gị uwe ahụ gị, nyekwa ya uwe ime ahụ gị.
30Nye onye ọbụla rịọrọ gị ihe. Ọ bụrụkwa na mmadụ ewere ihe bụ nke gị, agala ịnapụta ya.