11O ruo mgbe nwa oge gasịrị, ọ gara nʼobodo a na-akpọ Nain. Ndị na-eso ụzọ ya na ọtụtụ igwe mmadụ ndị ọzọ sooro ya gaa.
12Mgbe ọ na-abịaru nso nʼọnụ ụzọ e si abata nʼobodo ahụ, o nwere otu nwoke nwụrụ anwụ nke a na-ebupụ, otu nwa nke nne ya mụrụ. Nne ya ahụ bụ nwanyị di ya nwụrụ, oke igwe mmadụ si nʼobodo ahụ sonyekwara ya.
13Mgbe Onyenwe anyị hụrụ ya, o meere ya obi ebere ma sị ya, “Ebela akwa.”
14Mgbe ahụ ọ gara nso metụ igbe ozu ahụ aka, ndị bu ya kwụsịrị. Ọ sịrị, “Nwokorobịa, asị m gị bilie!”
15Nwoke ahụ nwụrụ anwụ biliri, nọdụ ala, bido ikwu okwu, ọ kpọnyere ya nne ya.