Luk 7

Mgbe ahụ ọ gara nso metụ igbe ozu ahụ aka, ndị bu ya kwụsịrị. Ọ sịrị, “Nwokorobịa, asị m gị bilie!”

Luke 7:14 (UKJV) And he came and touched the bier: and they that bare him stood still. And he said, Young man, I say unto you, Arise.

12Mgbe ọ na-abịaru nso nʼọnụ ụzọ e si abata nʼobodo ahụ, o nwere otu nwoke nwụrụ anwụ nke a na-ebupụ, otu nwa nke nne ya mụrụ. Nne ya ahụ bụ nwanyị di ya nwụrụ, oke igwe mmadụ si nʼobodo ahụ sonyekwara ya.

13Mgbe Onyenwe anyị hụrụ ya, o meere ya obi ebere ma sị ya, “Ebela akwa.”

14Mgbe ahụ ọ gara nso metụ igbe ozu ahụ aka, ndị bu ya kwụsịrị. Ọ sịrị, “Nwokorobịa, asị m gị bilie!”

15Nwoke ahụ nwụrụ anwụ biliri, nọdụ ala, bido ikwu okwu, ọ kpọnyere ya nne ya.

16Egwu tụrụ ha niile, ha tokwara Chineke sị, “Onye amụma dị ukwuu apụtala nʼetiti anyị, Chineke abịala inyere ndị ya aka!”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.