Luk 7

Nwa nke Mmadụ bịara na-eri ihe oriri na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, ma unu sịrị, ‘Lee, onye oke oriri na onye oke aṅụmaṅụ, enyi ndị ọna ụtụ na ndị mmehie.’

Luke 7:34 (UKJV) The Son of man has come eating and drinking; and all of you say, Behold a gluttonous man, and a wine indulger, a friend of publicans and sinners!

32Ha dị ka ụmụntakịrị nọ nʼọma ahịa na-akpọ ibe ha oku na-asị, “ ‘Anyị gburu unu ọja, ma unu adịghị ete egwu. Anyị bụrụ abụ ịkwa ozu, ma unu ebeghị akwa.’

33Nʼihi na Jọn omee baptizim bịara na-erighị achịcha maọbụ ṅụọ ihe ọṅụṅụ ma unu sịrị, ‘Mmụọ ọjọọ bi nʼime ya.’

34Nwa nke Mmadụ bịara na-eri ihe oriri na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, ma unu sịrị, ‘Lee, onye oke oriri na onye oke aṅụmaṅụ, enyi ndị ọna ụtụ na ndị mmehie.’

35Ma e sitela nʼụmụ ya niile nwapụta amamihe nʼonye ziri ezi.”

36Otu onye nʼime ndị Farisii kpọrọ ya oriri. Ọ gara nʼụlọ onye Farisii ahụ, ma nọdụ ala nʼoche nri.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.