34Nwa nke Mmadụ bịara na-eri ihe oriri na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, ma unu sịrị, ‘Lee, onye oke oriri na onye oke aṅụmaṅụ, enyi ndị ọna ụtụ na ndị mmehie.’
35Ma e sitela nʼụmụ ya niile nwapụta amamihe nʼonye ziri ezi.”
36Otu onye nʼime ndị Farisii kpọrọ ya oriri. Ọ gara nʼụlọ onye Farisii ahụ, ma nọdụ ala nʼoche nri.
37Ma otu nwanyị nke bi nʼobodo ahụ, onye birila ndụ mmehie, mgbe ọ matara na ọ nọ nʼụlọ onye Farisii ahụ na-eri nri, o jiri otu karama alabasta mmanụ otite bata nʼụlọ ahụ.
38Ka o guzoro nʼazụ ụkwụ ya na-ebe akwa, ọ malitere iji anya mmiri ya na-awụsa nʼụkwụ ya. O jiri agịrị isi ya hichaa anya mmiri ahụ, sutu ụkwụ ya ọnụ, ma wụsa mmanụ otite isi ụtọ ahụ na ha.