Luk 7

Saimọn zara sị, “Ọ dị m ka ọ bụ onye nke ọ gbaghara ụgwọ dị ukwuu.” Ọ sịrị ya, “Ị kpeziri.”

Luke 7:43 (UKJV) Simon answered and said, I suppose that he, to whom he forgave most. And he said unto him, You have rightly judged.

41“Ndị ikom abụọ ji onye na-ebinye ndị mmadụ ego nʼọmụrụnwa ụgwọ. Otu onye ji ya narị ego ise, onye nke ọzọ ji ya iri ego ise.

42Mgbe ha na-enweghị ike ịkwụghachi ụgwọ ha ji ya, ọ gbaghara ha ụgwọ ahụ. Ugbu a, onye nʼime ha ga-ahụ ya nʼanya karịa?”

43Saimọn zara sị, “Ọ dị m ka ọ bụ onye nke ọ gbaghara ụgwọ dị ukwuu.” Ọ sịrị ya, “Ị kpeziri.”

44Mgbe ahụ ọ tụgharịrị nʼebe nwanyị ahụ nọ gwa Saimọn sị, “Ị hụrụ nwanyị a? A batara nʼụlọ gị, i kunyeghị m mmiri ka m saa ụkwụ m, ma nwanyị a ejirila anya mmiri ya sachaa ụkwụ m, jirikwa agịrị isi ya hichaa ha.

45Ị sutughị m ọnụ, ma kemgbe m batara nʼụlọ a, o zubeghị ike isutu ụkwụ m ọnụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.