42Mgbe ha na-enweghị ike ịkwụghachi ụgwọ ha ji ya, ọ gbaghara ha ụgwọ ahụ. Ugbu a, onye nʼime ha ga-ahụ ya nʼanya karịa?”
43Saimọn zara sị, “Ọ dị m ka ọ bụ onye nke ọ gbaghara ụgwọ dị ukwuu.” Ọ sịrị ya, “Ị kpeziri.”
44Mgbe ahụ ọ tụgharịrị nʼebe nwanyị ahụ nọ gwa Saimọn sị, “Ị hụrụ nwanyị a? A batara nʼụlọ gị, i kunyeghị m mmiri ka m saa ụkwụ m, ma nwanyị a ejirila anya mmiri ya sachaa ụkwụ m, jirikwa agịrị isi ya hichaa ha.
45Ị sutughị m ọnụ, ma kemgbe m batara nʼụlọ a, o zubeghị ike isutu ụkwụ m ọnụ.
46Ị teghị m mmanụ ọbụla nʼisi, ma lee, o werela mmanụ otite isi ụtọ wụkwasị m nʼụkwụ.