Luk 8

na ụmụ nwanyị ụfọdụ ndị a chụpụrụ mmụọ ọjọọ site nʼime ha, gwọkwa ha nrịa nrịa: Meri Magdalin onye e sitere nʼime ya chụpụ mmụọ ọjọọ asaa,

Luke 8:2 (UKJV) And certain women, which had been healed of evil spirits and infirmities, Mary called Magdalene, out of whom went seven devils,

1Mgbe ihe ndị a gasịrị, ọ gara nʼobodo ukwu niile na nʼobodo nta niile na-ekwusa ma na-ewetakwara ndị mmadụ oziọma nke alaeze Chineke. Ndị ozi iri na abụọ ahụ sokwa ya,

2na ụmụ nwanyị ụfọdụ ndị a chụpụrụ mmụọ ọjọọ site nʼime ha, gwọkwa ha nrịa nrịa: Meri Magdalin onye e sitere nʼime ya chụpụ mmụọ ọjọọ asaa,

3na Joana nwunye Chuza onye na-elekọta ụlọeze Herọd na akụ ya niile, na Suzana, na ọtụtụ ndị ọzọ ndị ji akụ ha na-enyere ha aka.

4Mgbe oke igwe mmadụ gbakọrọ ha na ndị mmadụ si nʼobodo dị iche iche bịakwute ya. Ọ tụụrụ ha ilu a sị,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.