7Ụfọdụ dara nʼetiti ogwu, ogwu ndị a sooro ha puo ma kpagbuo ha.
8Ụfọdụ nʼime mkpụrụ dara nʼezi ala. Ha puputara, too, mịa mkpụrụ dị otu narị nʼọnụọgụgụ.” Mgbe o kwusiri nke a, ọ sịrị ha, “Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.”
9Ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya ihe ilu a pụtara.
10Ọ sịrị, “Ọ bụ unu ka e nyere ịmata ihe omimi niile nke alaeze Chineke, ma ndị ọzọ ga-anụ ya naanị nʼilu. Site nʼụzọ dị otu a, “ ‘ha ga na-ele anya, ma ha agaghị ahụ ihe ọbụla. Ha ga na-anụ ntị ma ha agaghị aghọta ihe ọbụla.’
11“Nke a bụ nkọwa ilu ahụ. Mkpụrụ ahụ bụ okwu Chineke.