Luk 9

O weere ogbe achịcha ise na azụ abụọ ndị ahụ, lelie anya nʼeluigwe, gọzie ma nyawaa ha, nye ndị na-eso ụzọ ya ka ha keere igwe mmadụ ahụ.

Luke 9:16 (UKJV) Then he took the five loaves and the two fishes, and looking up to heaven, he blessed them, and brake, and gave to the disciples to set before the multitude.

14Ndị nọ nʼebe ahụ ruru puku ndị nwoke ise. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Meenụ ka ha nọdụ ala nʼigwe nʼigwe, iri mmadụ ise, iri mmadụ ise.”

15Ha mere otu ahụ, mee ka ha niile nọdụ ala.

16O weere ogbe achịcha ise na azụ abụọ ndị ahụ, lelie anya nʼeluigwe, gọzie ma nyawaa ha, nye ndị na-eso ụzọ ya ka ha keere igwe mmadụ ahụ.

17Ha niile riri rijuokwa afọ, a tụtụkọtara ihe fọdụrụ, tụtụjuo nkata iri na abụọ nʼiberibe achịcha fọdụrụ.

18Otu ụbọchị mgbe ọ nọ naanị ya na-ekpe ekpere, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya. Ọ jụrụ ha sị, “Onye ka igwe mmadụ na-asị na m bụ?”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.