15Ha mere otu ahụ, mee ka ha niile nọdụ ala.
16O weere ogbe achịcha ise na azụ abụọ ndị ahụ, lelie anya nʼeluigwe, gọzie ma nyawaa ha, nye ndị na-eso ụzọ ya ka ha keere igwe mmadụ ahụ.
17Ha niile riri rijuokwa afọ, a tụtụkọtara ihe fọdụrụ, tụtụjuo nkata iri na abụọ nʼiberibe achịcha fọdụrụ.
18Otu ụbọchị mgbe ọ nọ naanị ya na-ekpe ekpere, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya. Ọ jụrụ ha sị, “Onye ka igwe mmadụ na-asị na m bụ?”
19Ha zara sị, “Ụfọdụ na-asị na ị bụ Jọn omee baptizim, ndị ọzọ sị na ị bụ Ịlaịja, ndị ọzọkwa, sị na ị bụ otu nʼime ndị amụma ochie ahụ si nʼọnwụ bilie.”