48Ọ gwara ha sị, “Onye ọbụla nabatara nwata a nʼaha m, nabatara m. Onye ọ bụlakwa nabatara m, nabatara onye zitere m. Ọ bụkwa onye dịkarịsịrị nta nʼetiti unu bụ onye kachasị ukwuu.”
49Jọn a zaa sị, “Nna anyị ukwu, anyị hụrụ otu onye ka o ji aha gị na-achụpụ mmụọ ọjọọ. Ebe ọ na-esoghị anyị, anyị gbochiri ya.”
50Jisọs sịrị ya, “Unu egbochila ya. Nʼihi na onye ọbụla na-adịghị emegide unu dịnyeere unu.”
51Mgbe oge o ji alaghachi na-abịaru nso, o chere ihu ya ịga Jerusalem.
52O zipụrụ ndị ozi, ka ha buru ya ụzọ gawa. Ka ha na-aga ha batara nʼotu obodo nta nke ndị Sameria ịkwado ihe niile tupu ọ bịa;