50Jisọs sịrị ya, “Unu egbochila ya. Nʼihi na onye ọbụla na-adịghị emegide unu dịnyeere unu.”
51Mgbe oge o ji alaghachi na-abịaru nso, o chere ihu ya ịga Jerusalem.
52O zipụrụ ndị ozi, ka ha buru ya ụzọ gawa. Ka ha na-aga ha batara nʼotu obodo nta nke ndị Sameria ịkwado ihe niile tupu ọ bịa;
53ma ha jụrụ ịnabata ya nʼihi na o chere ihu ịga Jerusalem.
54Mgbe Jemis na Jọn ndị na-eso ụzọ ya hụrụ nke a, ha sịrị ya, “Onyenwe anyị, ị chọrọ ka anyị nye iwu ka ọkụ site nʼeluigwe bịa laa ha nʼiyi?”