52O zipụrụ ndị ozi, ka ha buru ya ụzọ gawa. Ka ha na-aga ha batara nʼotu obodo nta nke ndị Sameria ịkwado ihe niile tupu ọ bịa;
53ma ha jụrụ ịnabata ya nʼihi na o chere ihu ịga Jerusalem.
54Mgbe Jemis na Jọn ndị na-eso ụzọ ya hụrụ nke a, ha sịrị ya, “Onyenwe anyị, ị chọrọ ka anyị nye iwu ka ọkụ site nʼeluigwe bịa laa ha nʼiyi?”
55Ọ tụgharịrị bara ha mba.
56Ma ha pụrụ banye nʼobodo nta ọzọ.