Malakaị 2

Unu esitela nʼoke okwu unu mee ka ike gwụ Onyenwe anyị. Ma unu na-ajụ, “Olee ụzọ anyị si mee ka ike gwụ ya?” Mgbe unu na-asị, “Ndị niile na-eme ihe ọjọọ dị mma nʼanya Onyenwe anyị. Ihe ha na-atọkwa ya ụtọ,” maọbụ na-asịkwa, “Ebee ka Chineke ahụ na-ekpe ikpe ziri ezi nọ?”

Malachi 2:17 (UKJV) All of you have wearied the LORD with your words. Yet all of you say, Wherein have we wearied him? When all of you say, Every one that does evil is good in the sight of the LORD, and he delights in them; or, Where is the God of judgment?

15Ọ bụ na ọ bụghị otu Chineke ahụ kere gị? Nʼanụ ahụ na nʼime mmụọ, unu bụ nke ya. Ma gịnị ka otu Chineke a chọrọ? Ka unu bụrụ ụmụ na-atụ ya egwu. Ya mere, jie mmụọ gị aka, ka ị gharakwa ịbụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼebe nwunye ị lụtara nʼokorobịa nọ.

16“Akpọrọ m ịgba alụkwaghị m asị,” ka Onyenwe anyị Chineke nke Izrel sịrị, “a kpọkwara nwoke na-emeso nwunye ya mmeso nʼụzọ ihe ike asị.” Ọ bụ Onyenwe Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu. Ya mere, kpachapụrụnụ onwe unu anya, unu abụkwala ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi.

17Unu esitela nʼoke okwu unu mee ka ike gwụ Onyenwe anyị. Ma unu na-ajụ, “Olee ụzọ anyị si mee ka ike gwụ ya?” Mgbe unu na-asị, “Ndị niile na-eme ihe ọjọọ dị mma nʼanya Onyenwe anyị. Ihe ha na-atọkwa ya ụtọ,” maọbụ na-asịkwa, “Ebee ka Chineke ahụ na-ekpe ikpe ziri ezi nọ?”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.