Mak 10

Jisọs sịrị ya, “Gịnị mere i ji akpọ m ezi mmadụ? Ọ dịghị onye ọbụla bụ ezi mmadụ ma ọ bụghị naanị Chineke.

Mark 10:18 (UKJV) And Jesus said unto him, Why call you me good? there is none good but one, that is, God.

16Mgbe ahụ, o kuuru ha nʼaka ya, bikwasị ha aka ya abụọ ma gọzie ha.

17Mgbe ọ na-ebili njem, otu nwoke gbaara ọsọ bịa gbuo ikpere nʼihu ya. Ọ jụrụ ya sị, “Ezi onye ozizi ọma, gịnị ka m ga-eme ka m keta ndụ ebighị ebi?”

18Jisọs sịrị ya, “Gịnị mere i ji akpọ m ezi mmadụ? Ọ dịghị onye ọbụla bụ ezi mmadụ ma ọ bụghị naanị Chineke.

19Ị maara ihe niile enyere nʼiwu: ‘Egbula mmadụ, a kwala iko, e zula ohi, a gbala ama ụgha, a ghọgbula mmadụ ibe gị, sọpụrụ nne na nna gị.’”

20Ọ sịrị ya, “E, onye ozizi, Edebezuchaala m ha niile siterị na mgbe m bụ nwata.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.