Mak 10

Mgbe ahụ, o kuuru ha nʼaka ya, bikwasị ha aka ya abụọ ma gọzie ha.

Mark 10:16 (UKJV) And he took them up in his arms, put his hands upon them, and blessed them.

14Ma mgbe Jisọs hụrụ nke a, iwe were ya nke ukwuu, ọ sịrị ha, “Hapụnụ ụmụntakịrị ka ha bịakwute m. Unu egbochikwala ha. Nʼihi na alaeze Chineke bụ nke ndị dị otu a.

15Nʼeziokwu asị m unu, onye ọbụla nke na-agaghị anabata alaeze Chineke dị ka nwantakịrị agaghị aba nʼime ya.”

16Mgbe ahụ, o kuuru ha nʼaka ya, bikwasị ha aka ya abụọ ma gọzie ha.

17Mgbe ọ na-ebili njem, otu nwoke gbaara ọsọ bịa gbuo ikpere nʼihu ya. Ọ jụrụ ya sị, “Ezi onye ozizi ọma, gịnị ka m ga-eme ka m keta ndụ ebighị ebi?”

18Jisọs sịrị ya, “Gịnị mere i ji akpọ m ezi mmadụ? Ọ dịghị onye ọbụla bụ ezi mmadụ ma ọ bụghị naanị Chineke.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.