6Ma na mmalite nke okike ụwa, Chineke ‘kere ha nwoke na nwanyị.’
7‘Nʼihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nne ya na nna ya e jikọta ya na nwunye ya.
8Ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ.’ Ya mere, ha abụkwaghị mmadụ abụọ ọzọ, kama otu anụ ahụ.
9Ya mere, ihe Chineke jikọtara, ka mmadụ ọbụla atọsala ya.”
10Mgbe ha banyere nʼụlọ, ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya ọzọ ihe banyere okwu a.