19Mgbe uhuruchi bịara, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya siri nʼobodo ahụ pụọ.
20Nʼisi ụtụtụ echi ya, mgbe ha na-agafe, ha hụrụ na osisi fiig a esitela na mgbọrọgwụ ya kpọnwụọ.
21Pita chetara ihe merenụ ma sị ya, “Onye ozizi, lee! Osisi fiig ahụ ị bụrụ ọnụ akpọnwụọla!”
22Jisọs zara ha sị, “Nweenụ okwukwe nʼime Chineke.
23Nʼezie agwa m unu, ọ bụrụ na onye ọbụla asị ugwu a, ‘Si nʼebe a wezuga onwe gị, gaa dabanye nʼoke osimiri,’ nke na-enweghị obi abụọ nʼime ya, kama o kweere na ihe o kwuru ga-emezu, ihe ahụ ọ kwuru ga-emezukwa.