27Mgbe ha rutere Jerusalem ọzọ, ọ nọ na-ejegharị nʼime ogige ụlọnsọ ukwu ahụ, ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu na ndị okenye ndị Juu bịakwutere ya.
28Ha sịrị ya, “Olee ikike i ji eme ihe ndị a ị na-eme? Onye nyere gị ikike ime ha?”
29Jisọs sịrị ha, “Aga m ajụ unu otu ajụjụ, unu zaa m ya, aga m agwakwa unu onye nyere m ikike m ji eme ihe ndị a.
30Baptizim nke Jọn, o sitere nʼeluigwe ka ọ bụ nʼaka mmadụ? Gwanụ m.”
31Ha kparịtara ụka nʼetiti onwe ha ma sị, “Ọ bụrụ na anyị asị, ‘O sitere nʼeluigwe,’ ọ ga-asị anyị, ‘Gịnị mere unu na-ejighị kwenye na ya?’