8Ha jidere ya gbuo ya, tufee ozu ya nʼazụ mgbidi ubi vaịnị ahụ.
9“Gịnị ka unu chere onyenwe ubi vaịnị ahụ ga-eme? Ọ ga-abịa laa ndị ajọ mmadụ ahụ nʼiyi. Ọ ga-enyefekwa ubi vaịnị ahụ nʼaka ndị ọzọ.
10Ọ bụ na unu agụbeghị akwụkwọ nsọ a na-asị, “ ‘Nkume ndị na-ewu ụlọ jụrụ abụrụla nkume isi ntọala ụlọ.
11Ọ bụ Onyenwe anyị rụrụ nke a, ọ dịkwa ịtụnanya nʼanya anyị’ ?”
12Mgbe ahụ ndịisi nchụaja, ndị nkuzi iwu na ndị okenye chọrọ ụzọ ha ga-esi jide ya nʼihi na ha matara na ilu ahụ ọ tụrụ megidere ha. Ma ha tụrụ egwu igwe ndị mmadụ ahụ, ya mere ha hapụrụ ya pụọ.