28Otu nʼime ndị ozizi iwu bịara nʼoge ahụ ha na-arụrịta ụka. Mgbe ọ hụrụ na o nyere ha ezi ọsịsa, ọ jụrụ ya sị, “Nʼime iwu niile olee nke kachasị mkpa?”
29Jisọs zara ya sị, “Nke kachasị mkpa bụ nke a, ‘Nụrụ gị Izrel, Onyenwe anyị bụ Chineke anyị, Onyenwe anyị bụ otu.
30Were obi gị niile na mkpụrụobi gị niile na uche gị niile na ike gị niile hụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nʼanya.’
31Nke abụọ ya bụ nke a, ‘Hụ onye agbataobi gị nʼanya dị ka onwe gị.’ Ọ dịghị iwu ọzọ dị nke karịrị ndị a.”
32Onye ode akwụkwọ ahụ sịrị ya, “Onye ozizi, nʼezie, ị zara nke ọma na Chineke bụ otu, na enweghịkwa chi ọzọ dị karịa ya.