Mak 13

“Ya mere nọrọnụ na nche, nʼihi na unu amaghị mgbe Onyenwe ụlọ ga-alọta. Ma ọ bụ nʼuhuruchi maọbụ nʼetiti abalị. Maọbụ mgbe ọkụkụ kwara akwa, maọbụ nʼisi ụtụtụ.

Mark 13:35 (UKJV) Watch all of you therefore: for all of you know not when the master of the house comes, at even, or at midnight, or at the cockcrowing, or in the morning:

33Ebe ọ bụ na unu amaghị mgbe ha ga-emezu, nọrọnụ na nche! Mụrụkwanụ anya!

34Ọ dị ka nwoke hapụrụ ụlọ ya na-aga njem, tinye nʼaka ndị ohu ya ilekọta ihe, onye ọbụla nʼime ha ka o nyere ọrụ ọ ga-arụ ma nyekwa onye nche ọnụ ụzọ iwu ka ọ nọ na nche.

35“Ya mere nọrọnụ na nche, nʼihi na unu amaghị mgbe Onyenwe ụlọ ga-alọta. Ma ọ bụ nʼuhuruchi maọbụ nʼetiti abalị. Maọbụ mgbe ọkụkụ kwara akwa, maọbụ nʼisi ụtụtụ.

36Ọ bụrụ na ọ lọta na mberede, unu ekwela ka ọ lọkwute unu mgbe unu nọ nʼụra.

37Ihe m gwara unu ka m na-agwakwa mmadụ niile. ‘Nọrọnụ na nche.’ ”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.