Mak 14

Abalị abụọ tupu e mee Mmemme Ngabiga na mmemme achịcha na-ekoghị eko, ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu nọkwa na-achọ ụzọ aghụghọ ha ga-esi jide Jisọs gbuo ya.

Mark 14:1 (UKJV) After two days was the feast of the passover, and of unleavened bread: and the chief priests and the scribes sought how they might take him by craft, and put him to death.

1Abalị abụọ tupu e mee Mmemme Ngabiga na mmemme achịcha na-ekoghị eko, ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu nọkwa na-achọ ụzọ aghụghọ ha ga-esi jide Jisọs gbuo ya.

2Ma ha kwuru sị, “Ọ gaghị abụ nʼoge mmemme a, ka ọgbaaghara ghara ịdị.”

3Ka ọ nọdụrụ nʼoche nri na Betani nʼụlọ Saimọn onye ekpenta, otu nwanyị bu karama alabasta mmanụ otite dị oke ọnụahịa, nke e jiri ezigbo naad mee, batara. Ọ kụwara karama ahụ, wụsa ya mmanụ otite ahụ nʼisi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.