23Mgbe ahụ, o buuru iko, nye ekele bunyekwa ha. Ha niile ṅụrụ site nʼotu iko ahụ.
24Ọ sịrị ha, “Nke a bụ ọbara m nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, nke a na-awụfu nʼihi ọtụtụ mmadụ.
25Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, agaghị m aṅụ mmanya vaịnị ọzọ tutu ruo ụbọchị ahụ, mgbe m ga-aṅụ ya ọhụrụ nʼalaeze Chineke.”
26Mgbe ha bụsịrị abụ, ha pụrụ gaa nʼUgwu Oliv.
27Jisọs sịrị ha, “Unu niile ga-agbahapụ m, nʼihi na e dere ya otu a sị, “ ‘Aga m etigbu onye ọzụzụ atụrụ, igwe atụrụ ga-agbasasịkwa.’