49Ụbọchị niile ka mụ na unu nọ mgbe m na-ezi ihe nʼụlọnsọ ukwu, ma unu ejideghị m. Ma ihe akwụkwọ nsọ kwuru aghaghị imezu.”
50Mgbe ahụ, ha niile hapụrụ ya gbalaga.
51Ọ dị otu nwokorobịa na-eso ya, ọ ji naanị akwa ọcha linin kpuchie onwe ya. Mgbe ha jidere ya,
52ọ hapụụrụ ha akwa ọcha linin ya, gbara ọtọ gbalaga.
53Ha duuru Jisọs gakwuru onyeisi nchụaja, ha niile bụ ndịisi nchụaja, na ndị okenye na ndị ozizi iwu zukọrọ nʼebe ahụ.