60Mgbe ahụ, onyeisi nchụaja biliri ọtọ nʼihu ha, jụọ Jisọs ajụjụ sị, “Ọ bụ na ị nweghị ihe ọbụla ị ga-aza? Gịnị ka i nwere ikwu banyere ama ndị a a na-agba megide gị?”
61Ma ọ gbakwara nkịtị, ọ zaghị ihe ọbụla. Ọzọkwa, onyeisi nchụaja jụrụ ya sị, “Ị bụ Kraịst, Ọkpara Onye a gọziri agọzi?”
62Jisọs sịrị, “Abụ m ya, unu ga-ahụkwa Nwa nke Mmadụ ka ọ na-anọdụ ala nʼaka nri nke Onye ji ike niile, na-abịakwa nʼigwe ojii nke eluigwe.”
63Onyeisi nchụaja dọwara uwe ya kwuo sị, “Gịnị mere anyị ji achọ ndị akaebe ọzọ?
64Unu anụla okwu nkwulu si ya nʼọnụ pụta! Gịnị bụ mkpebi unu?” Ha niile mara ya ikpe sị, “O kwesiri ka ọ nwụọ!”