58“Anyị nụrụ mgbe o kwuru sị, ‘Aga m akwatu ụlọnsọ ukwu a nke e ji aka wuo, nʼụbọchị atọ aga m ewukwa ụlọ ọzọ, nke a na-ejighị aka wuo.’ ”
59Ọ bụladị na nke a, ama ha niile adakọtakwaghị nʼotu.
60Mgbe ahụ, onyeisi nchụaja biliri ọtọ nʼihu ha, jụọ Jisọs ajụjụ sị, “Ọ bụ na ị nweghị ihe ọbụla ị ga-aza? Gịnị ka i nwere ikwu banyere ama ndị a a na-agba megide gị?”
61Ma ọ gbakwara nkịtị, ọ zaghị ihe ọbụla. Ọzọkwa, onyeisi nchụaja jụrụ ya sị, “Ị bụ Kraịst, Ọkpara Onye a gọziri agọzi?”
62Jisọs sịrị, “Abụ m ya, unu ga-ahụkwa Nwa nke Mmadụ ka ọ na-anọdụ ala nʼaka nri nke Onye ji ike niile, na-abịakwa nʼigwe ojii nke eluigwe.”