23Ha nyere ya mmanya a gwara máá, ma ọ jụrụ ịṅụ ya.
24Emesịa, ha kpọgidere ya nʼobe, ma kee uwe ya nʼetiti onwe ha site nʼife nza onye ga-enwe nke ọ ga-ewe.
25Ha kpọgidere ya nʼobe nʼelekere itoolu nke ụtụtụ.
26Ha depụtara ebubo ha boro ya kwụba ya nʼelu obe ahụ, nke bụ: Eze ndị Juu.
27Ha kpọgidekwara ya na ndị ohi abụọ nʼobe, otu nʼaka nri ya, nke ọzọ nʼaka ekpe ya.