21Ha zutere otu onye na-agata nʼụzọ, aha ya bụ Saimọn, onye Sirini, bụ nna Alegzanda na Rufọs. Ha manyere ya ka o buru obe ya.
22Nʼikpeazụ, ha duuru Jisọs ruo ebe a na-akpọ Gọlgọta (nke pụtara “ebe okpokoro isi”).
23Ha nyere ya mmanya a gwara máá, ma ọ jụrụ ịṅụ ya.
24Emesịa, ha kpọgidere ya nʼobe, ma kee uwe ya nʼetiti onwe ha site nʼife nza onye ga-enwe nke ọ ga-ewe.
25Ha kpọgidere ya nʼobe nʼelekere itoolu nke ụtụtụ.