26Ha depụtara ebubo ha boro ya kwụba ya nʼelu obe ahụ, nke bụ: Eze ndị Juu.
27Ha kpọgidekwara ya na ndị ohi abụọ nʼobe, otu nʼaka nri ya, nke ọzọ nʼaka ekpe ya.
28A gụkọtara ya na ndị na-emebi iwu.
29Ndị mmadụ si nʼebe ahụ gafee fufere isi ha na-ekwutọ ya, na-asị, “Leenụ gị! Onye ga-akwada ụlọnsọ ma wugharịa ya nʼabalị atọ.
30Zọpụtanụ onwe gị! Si nʼelu obe ahụ rịdata.”